Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 18 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Ọktoba 2027

Mọnde · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Onye nsọ Luk, Onye dere Oziọma

Mmemme · Agba ofufe: uhie

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Tm 4:9–17

9Gbalịsie ike ịbịakwute m ọsịịsọ, 10nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia. 11Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m. 12Ezipụla m Taịkikọs ka ọ gaa Efesọs. 13Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ nʼaka Kapọs na Troas, wetakwara m akwụkwọ m niile ahụ dị nʼebe ahụ, ọkachasị akwụkwọ akpụkpọ anụ niile ahụ. 14Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-akwụghachi ya dị ka ihe o mere m si dị. 15Kpachara anya nʼebe ọ nọ, nʼihi na o guzosiri ike megide ihe niile anyị kwuru. 16Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie. 17Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 145:10–13, 17–18

10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. 11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị, 12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị. 13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 17Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 18Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.

Oziọma

Luk 10:1–9

1Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara iri mmadụ asaa na abụọ ndị ọzọ, zipụ ha mmadụ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa nʼobodo niile nakwa ebe niile ọ na-achọ ịga. 2Ọ sịrị ha, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu ma ndị ọrụ dị naanị ole na ole. Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya. 3Gaanụ! Ma lee, ana m ezipu unu dị ka ụmụ atụrụ nʼetiti agụ. 4Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ. 5“Mgbe unu banyere nʼụlọ ọbụla, burunu ụzọ sị, ‘Udo dịrị nʼụlọ a.’ 6Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nʼụlọ ahụ, udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nʼụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitekwara unu. 7Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ. 8“Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu. 9Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike