Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 17 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Ọktoba 2027

Sọnde · Izu nke 29 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 29 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 53:10–11

10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ. Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie. Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge. Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya. 11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ, ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya, site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume, ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 33:4–5, 18–20, 22

4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ. 20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. 22O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Hib 4:14–16

14Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike. 15Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya. 16Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.

Oziọma

Mak 10:35–45

35Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.” 36Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 37Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.” 38Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?” 39Ha zaghachiri ya, “Anyị pụrụ.” Jisọs sịrị ha, “Unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim nke a ga-eme m. 40Ma ịnọdụ nʼaka nri m maọbụ nʼaka ekpe m abụghị ihe dịrị m inye, kama ọnọdụ ndị a dịịrị ndị a kwadooro ha.” 41Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, iwe jupụtara ha obi nʼihi Jemis na Jọn. 42Ma Jisọs kpọkọtara ha niile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze nke ndị mba ọzọ, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 43Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama onye ọbụla chọrọ ịdị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. 44Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu, ga-abụ ohu mmadụ niile. 45Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike