Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 16 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 3 Ọktoba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Ọktoba 2027

Satọdee · Izu nke 17 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Hieromartyr Dionysius the Areopagite, Bishop of Athens († 96)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Kọ 14:20–25

20Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a. 21E dere ya nʼakwụkwọ iwu, “Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche ka m ga-agwa ndị a okwu, ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị, ka Onyenwe anyị kwuru.” 22Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe. 23Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a? 24Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie. 25Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.”

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Daịonisiọs onye Areopagọs)

Ọrụ 17:16–34

16Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ. 17Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu. 18Ya na ụfọdụ ndị Epikuri na ndị Stoịk bụ ndị ọkachamara na-arụrịta ụka. Ndị ụfọdụ na-asị, “gịnị ka onye ekwurekwu a ga-ekwu?” Ndị ọzọ sịrị, “ọ dịka onye na-ekwusa ụmụ mmụọ ndị ala ọzọ.” Ha kwuru nke a nʼihi na ọ na-ekwusa oziọma banyere Jisọs na mbilite nʼọnwụ ya. 19Ha kpọbatara ya nʼebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Areopagọs, ebe ha nọ sị ya, “Anyị enwere ike ịmata ihe banyere ozizi ọhụrụ gị a? 20Ị na-ekwu ihe ndị na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịmata ihe ndị a nke ọma.” 21(Ndị Atens niile na ndị ala ọzọ bi nʼobodo ahụ, enweghị ohere ime ihe ọbụla, ọ gwụchaala ọrụ ikwu na ịnụ banyere ihe dị ọhụrụ.) 22Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe. 23Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu. 24“Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo. 25Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile. 26O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha. 27Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya. 28‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’ 29“Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ. 30Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa. 31Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.” 32Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.” 33Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha. 34Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.

Oziọma

Luk 5:17–26

17Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa. 18Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya. 19Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs. 20Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.” 21Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, “Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma ọ bụghị naanị Chineke?” 22Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu? 23Olee nke ka mfe ikwu: Ọ bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ị sị, Bilie jee ije? 24Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!” 25Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya. 26Ihe ndị a juru onye ọbụla anya, ha tokwara Chineke. Oke egwu jupụtakwara ha nʼahụ, ha sịrị, “Anyị ahụla ihe ebube taa.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Ọktoba na kalenda nzukọ bụ 16 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike