Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 13 Ọktoba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Ọktoba 2027

Wenezdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Rom 2:1–11

1Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ. 2Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nʼụzọ ziri ezi. 3Gị bụ mmadụ, gịnị mere i ji na-ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ. I chere na ị ga-agbanarị ikpe Chineke? 4Ka ị na-eleda obiọma Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachiobi ya anya? Ị maghị na obiọma Chineke nwere nʼebe ị nọ kwesiri ime ka i site na mmehie gị chegharịa? 5Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi. 6Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị. 7Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi. 8Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma. 9Nsogbu na iru ụjụ ga-abịakwasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ, mbụ, ọ ga-adịrị ndị Juu, emechaa, ọ ga-adịkwara ndị mba ọzọ. 10Ma otuto na nsọpụrụ na udo ga-abụ nke onye ọbụla na-eme ezi ihe, malite nʼonye Juu ruokwa na ndị mba ọzọ. 11Nʼihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nʼihu.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 62:1–2, 5–6, 8

1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike. Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa. 2Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m; ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa. 6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela

Oziọma

Luk 11:42–46

42“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, nʼihi na unu na-enye otu ụzọ nʼụzọ iri nʼihi mint, na mkpa akwụkwọ na-esi isi ụtọ na mkpa akwụkwọ niile dị iche iche nke ubi, ma leghara ikpe ziri ezi na ịhụnanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka unu kwesiri ime nʼelegharaghị ihe ndị ọzọ anya. 43“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii! Nʼihi na unu na-ahụ ịnọ nʼisi oche niile nʼụlọ ekpere na ekele pụrụ iche a na-ekele unu nʼọma ahịa nʼanya. 44“Ahụhụ ga-adịrị unu, nʼihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ihe, nke ndị mmadụ na-agafe nʼelu ha nʼihi na ha amaghị na ọ bụ ili.” 45Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.” 46Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike