Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 12 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Ọktoba 2027
Tiuzdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
16Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik. 17Nʼihi na ọ bụ nʼoziọma ka e kpughere ezi omume Chineke, ezi omume nke na-esite nʼokwukwe ruo okwukwe. Dịka e siri dee ya, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” 18Nʼihi na e sitela nʼeluigwe kpughe ọnụma Chineke megide mmehie na ajọ omume niile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nʼajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ. 19Nʼihi na ndị a maara ihe ha kwesiri ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nʼihi na Chineke nʼonwe ya emeela ka o doo ha anya. 20Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ. 21Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị. 22Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu. 23Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesiri inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ. Ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na nnụnụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nʼala. 24Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha. 25Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya. 2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. 3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha. 4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
Oziọma
37Mgbe ọ na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa soro ya rie nri. Ọ banyere nọrọ nʼoche nri. 38O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe ọ bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupu ya ebido. 39Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche. 40Ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya? 41Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike