Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 13 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 30 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Ọktoba 2027
Wenezdee · Izu nke 17 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Gregory, Bishop and Enlightener of Great Armenia († c. 335)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8Ọ bụ ezie na mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nʼetiti ndị nsọ niile, e nyere m amara nke a, ikwusara ndị mba ọzọ oziọma banyere akụ nke enweghị atụ nke juru nʼime Kraịst, 9meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ. 10Ka ọ ga-abụ site na chọọchị, a ga-eme ka amamihe Chineke nʼụdị dị iche iche bụrụ ihe ọchịchị na ikike niile dị nʼeluigwe ga-amata. 11Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, 12bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya. 13Nʼihi nke a, arịọ m ka unu ghara ịda mba maka mkpagbu m nʼihi unu, ha bụ otuto nye unu. 14Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị, 15onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha. 16Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu; 17ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya. 18Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi, 19na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke. 20Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị, 21ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen.
Akwụkwọ ozi (maka Tọọzdee)
14Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie. 15Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst. 16Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya. 17Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru. 18Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa. 19Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu.
Oziọma
33Ha sịrị, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere oge niile, ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri, na-aṅụkwa.” 34Jisọs sịrị ha, “Ndị a kpọrọ oriri nʼọlụlụ di na nwunye, ha ga-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ? 35Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.” 36Ọ tụụrụ ha ilu a, “O nweghị onye na-adọkara akwa ọhụrụ were ya kwachie akwa ochie. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọ pụtara na a dọwaala akwa ọhụrụ ahụ nʼihi na nke ahụ eji kwachie ya agaghị adaba. 37Nʼụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị agbanye mmanya ọhụrụ dị ike nʼime karama akpụkpọ ochie. Nʼihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama ahụ a laa nʼiyi. 38Ma ọ dị mma ịgbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ. 39O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nʼihi na ọ ga-asị, ‘Nke ochie ahụ ka mma.’ ”
Oziọma (maka Tọọzdee)
12Nʼụbọchị ndị ahụ, ọ gara rigoro nʼelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọrọ abalị ahụ niile na-ekpe ekpere nye Chineke. 13Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị niile na-eso ụzọ ya, site nʼime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya. 14Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita) na Andru nwanne ya, Jemis Jọn, Filip Batalomi. 15Matiu Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt. 16Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye. 17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Septemba na kalenda nzukọ bụ 13 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike