Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 14 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Ọktoba 2027
Tọọzdee · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Kalistọs nke Mbụ, Pope na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
21Ma ugbu a, emeela ka ezi omume Chineke pụta ìhè, site nʼiguzo iche nʼebe iwu dị, bụ nke iwu na ndị amụma gbakwara ama ya. 22Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya. 23Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke. 24Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs. 25Onye Chineke họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja ikpuchi mmehie, site nʼiwufu ọbara ya maka mgbaghara mmehie, nke a ga-anata site nʼokwukwe. Nʼụzọ dị otu a, ọ na-egosipụta ezi omume ya, maka oge gara aga, nʼihi nnagide ya, o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya. 26Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na Jisọs. 27Mgbe o si otu a dịrị, olee ebe ịnya isi anyị dịkwa? Ajụla ịnabata ya. Ọ bụ site iwu dị aṅa? Ọ bụ nke ọrụ? Mba, kama ọ bụ site nʼokwukwe anyị nwere nʼime Kraịst. 28Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru. 29Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ. 30Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. 2Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara. 3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
Oziọma
47“Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu. 48Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha. 49Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu. 50Nʼihi nke a, ọgbọ a ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma niile a wufuru, site na mmalite nke ụwa, 51site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a. 52“Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu, nʼihi na unu wepụrụ ọtụghe igodo nke amamihe. Unu onwe unu abanyeghị, ma unu gbochikwara ndị na-abata ịbata.” 53Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya, na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu, 54na-esiri ya ọnya, ka ha mara ma ọ ga-ekwuhie ọnụ, ka ha hụ ihe ha ga-eji jide ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Kalistọs nke Mbụ, Pope na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike