Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 11 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 11 Ọktoba 2027
Mọnde · Izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 28 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Jọn nke Iri Abụọ na Atọ, Pope · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Pọl, odibo Kraịst Jisọs, onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi ya na onye o kewapụtara ka o zisaa oziọma ya. 2Oziọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nʼoge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya nke e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ. 3Oziọma a metụtara Ọkpara ya, onye bụ nwa Devid site nʼọmụmụ nke anụ ahụ. 4Onye esitere na Mmụọ nke ịdị nsọ họpụta ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼike nke mbilite nʼọnwụ, bụ Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị. 5Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara na ọrụ ị bụ onyeozi, ime ka ndị mba ọzọ nwee nrube isi nke okwukwe nʼetiti ha nʼihi aha ya. 6Tinyere unu onwe unu ndị ahụ a kpọrọ ka ha bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst. 7Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
Oziọma
29Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona. 30Nʼihi na dị ka Jona si bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi bụrụkwa ihe ama nye ọgbọ a. 31Nʼụbọchị ahụ, eze nwanyị ndị ndịda ga-ebili soro ndị ọgbọ a guzo nʼikpe, maa ha ikpe, nʼihi na o sitere na nsọtụ nke ụwa bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn, ma lee, onye karịrị Solomọn nọ nʼebe a. 32Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe, nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona, ma lee, onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn nke Iri Abụọ na Atọ, Pope
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike