Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 10 Ọktoba

Kalenda Ọtọdọks · 27 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Ọktoba 2027

Sọnde · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 16 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 5

Luk 24:12–35

12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara. 13Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem. 14Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere. 15Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije. 16Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya. 17Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha. 18Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?” 19Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile. 20Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe. 21Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere. 22Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a. 23Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ. 24Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.” 25Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru. 26Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?” 27Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile. 28Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya. 29Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha. 30Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha. 31Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ. 32Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?” 33Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe, 34na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.” 35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.

Akwụkwọ ozi

2Kọ 6:1–10

1Dịka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nʼotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nʼefu. 2Nʼihi na ọ na-ekwu, “Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu. Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta. 3Anyị etinyeghị ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ onye ọbụla ka ọ ghara iwetara ọrụ anyị ihe ịta ụta. 4Kama nʼime ihe niile, anyị na-agbalịsị ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachiobi na-edi nsogbu niile na mkpagbu niile na ahụhụ niile na-adakwasị anyị. 5A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri, 6nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ, 7sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe. 8Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu. 9Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị. 10Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile.

Oziọma

Luk 5:1–11

1Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke. 2Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ. 3Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe. 4Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.” 5Saimọn zara sị, “Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile.” 6Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị. 7Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu. 8Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.” 9Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. 10Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, “Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ.” 11Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Septemba na kalenda nzukọ bụ 10 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike