Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 6 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Ọktoba 2027
Wenezdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Bruno, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ. 2Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị. 3Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. Ọ ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.” 4Ma Onyenwe anyị sịrị, “O ziri ezi na ị ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?” 5Mgbe ahụ, Jona si nʼebe ahụ pụọ jee nọdụ ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. O weere ahịhịa meere onwe ya ụlọ ndo, nọdụ nʼime ya, chere ka ọ hụ ihe gaje ime obodo ahụ. 6Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara, nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ. 7Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ. 8O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.” 9Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.” 10Mgbe ahụ Onyenwe anyị kwuru, “I nwere obi ebere nʼebe osisi a dị, nke ị na-akụghị na nke i mekwaghị ka o too, bụ nke toro nʼanyasị, nwụọkwa nʼanyasị. 11Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?”
Abụ Ọma nzaghachi
3meere m ebere, O Onyenwe m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile. 4Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m. 5Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị. 6O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere. 9Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube. 10Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ Chineke.
Oziọma
1Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.” 2Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa. 3Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị. 4Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Bruno, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike