Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 6 Ọktoba
Kalenda Ọtọdọks · 23 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Ọktoba 2027
Wenezdee · Izu nke 16 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Conception by St Elizabeth of the Honorable Glorious Prophet, Forerunner and Baptizer of the Lord John
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst. 3Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na o nwere ihe ya bụ mgbe o nweghị ihe ọ bụ, onye ahụ na-eduhie onwe ya ụzọ. 4Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị. 5Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya. 6Ka onye a na-akụziri okwu ahụ jisie ike ka ya na onye nkuzi ya na-ekekọ ezi ihe niile. 7Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ. 8Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi. 9Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba. 10Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
Akwụkwọ ozi (maka Onye bu ụzọ)
22Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ na Ebraham nwere ụmụ nwoke abụọ. Otu nʼime ha bụ nwa nke ohu ya nwanyị mụrụ, nke ọzọ bụ nke nwunye ya na-abụghị ohu mụtara. 23Nwa ahụ nke ohu nwanyị ahụ mụrụ bụ onye amụrụ site na anụ ahụ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ onye a mụrụ site na nkwa. 24Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega. 25Hega bụ Ugwu Saịnaị nke dị nʼArebịa. Ọ dabara nʼọnọdụ Jerusalem nke ugbu a, nʼihi na ya na ụmụ ya nọ nʼohu. 26Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị. 27Nʼihi na e dere ya, “Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga, onye na-amụtaghị nwa. Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ike gị onye ime nwa na-emetụbeghị, nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.” 28Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik. 29Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a. 30Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.” 31Ya mere, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke nwanyị ohu, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị nwere onwe ya.
Oziọma
1Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara. 2Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya. 3Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.” 4Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ” 5Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya. 6Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha. 7Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.” 8Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ” 9Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala. 10Nʼihi na e dere ya, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichekwa gị nke ọma; 11ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’” 12Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa. ” 13Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara. 14Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile. 15O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya.
Oziọma (maka Onye bu ụzọ)
5Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn. 6Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla. 7Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi. 8O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke. 9A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ. 10Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere. 11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya. 12Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu. 13Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn. 14Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya. 15Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ. 16Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha. 17Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.” 18Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.” 19Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a. 20Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.” 21Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ. 22Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu. 23Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya. 24Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. 25Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Septemba na kalenda nzukọ bụ 6 Ọktoba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike