Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọktoba 2027 › 7 Ọktoba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Ọktoba 2027
Tọọzdee · Izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 27 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Nne anyị nke Rosari · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
13Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Unu ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m.” “Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị ka anyị kwuru megide gị?’ 14“Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile? 15Ma site ugbu a gaa nʼihu, ndị nganga ka anyị ga-akpọ ndị ihe na-agara nke ọma. Nʼezie, ndị na-eme ihe ọjọọ ka ihe na-agara nke ọma. Ndị ahụ jikwa ihe ọjọọ ha na-anwa Chineke na-agbanarị ntaramahụhụ ya.’ ” 16Mgbe ahụ, ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị gwarịtara ibe ha okwu, Onyenwe anyị ṅara ntị, nụkwa ihe ha na-ekwu. Nʼihu ya, e nwere akwụkwọ ncheta dị ya, ebe e dere aha ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma na-echekwa echiche banyere aha ya. 17“Nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “ha ga-abụ ihe oke ọnụahịa nke aka m. Aga m echebe ha, dịka nna na-enwe ọmịiko ma chebekwa nwa ya nwoke na-efe ya. 18Unu ga-ahụ ihe dị iche nʼetiti ndị ezi omume na ndị ajọ omume, hụkwa ihe dị iche nʼetiti ndị na-efe Chineke na ndị na-adịghị efe ya. 4:1“Nʼezie, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ ga-erekwa ọkụ dịka ebe a funyere ọkụ buru ibu. Mgbe ndị nganga, ndị na-eme ihe ọjọọ, ga-abụ igbugbo ọka, ụbọchị ahụ na-abịa ga-erechapụ ha,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ọ dịkwaghị mgbọrọgwụ maọbụ alaka ọbụla ga-afọdụrụ ha. 2Ma unu bụ ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-achawapụta wetakwara unu ọgwụgwọ nke si nʼime nku ya. Unu ga-apụkwa, na-awụgharị dịka ụmụ ehi eji nri zujuo afọ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Oziọma
5Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ, 6nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’ 7Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’ 8Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa. 9“Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. 10Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. 11“Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ? 12Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị? 13Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike