Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 11 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 29 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Septemba 2027
Satọdee · Izu nke 12 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
The Beheading of the Holy Glorious Prophet, Forerunner and Baptist of the Lord, John
Obubu ọnụ otu ụbọchị · Obubu ọnụ siri ike
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
1Nʼoge a Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs. 2Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. O sitela na ndị nwụrụ anwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere ike ịrụ ọrụ ebube ndị a ji dị nʼime ya.” 3Nʼihi na, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nʼụlọ mkpọrọ, nʼihi Herodịas nwunye Filip nwanne ya nwoke. 4Nʼihi na Jọn gwara ya, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ ya.” 5Herọd chọrọrị igbu ya, ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha weere Jọn dị ka onye amụma. 6Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. 7Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ. 8Ma dị ka nne ya si haziere ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, “Nye m isi Jọn omee baptizim nʼefere ugbu a.” 9Arịrịọ a wutere eze Herọd, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ na nʼihi ndị ọbịa ya niile, ọ chọghị ịla azụ nʼokwu ya. O nyere iwu ka e meere ya ihe ọ chọrọ. 10O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 11E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya. 12Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere. 13Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala.
Akwụkwọ ozi (maka Onye bu ụzọ)
25Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’ 26“Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile. 27Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ. 28Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya. 29Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya. 30Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie. 31Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya. 32“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha.
Oziọma (maka Onye bu ụzọ)
14Eze Herọd nụrụ akụkọ banyere ya, nʼihi na aha Jisọs aghọọla okwu a kpụ nʼọnụ. Ụfọdụ na-asị, na ọ bụ “Jọn omee baptizim; na e meela ka o site na ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa nke a mere ka ike ọrụ ebube ji dị nʼime ya.” 15Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ Ịlaịja.” Ma ndị ọzọkwa kwuru na ọ bụ onye amụma dị ka otu nʼime ndị amụma mgbe ochie. 16Ma mgbe Herọd nụrụ nke a, ọ sịrị, “Jọn onye ahụ m bipụrụ isi, emeela ka ọ site nʼọnwụ bilie!” 17Nʼihi na Herọd nʼonwe ya nyererị iwu ka e jide Jọn kee ya agbụ tụba ya nʼụlọ mkpọrọ. O mere nke a nʼihi Herodịas bụrịị nwunye Filip nwanne ya, onye ọ kpọrọ dịka nwunye ya. 18Nʼihi na Jọn gwara Herọd sị, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ nwunye nwanne gị nwoke.” 19Nʼihi ya Herodịas bu iro nʼobi megide Jọn na-achọkwa ụzọ igbu ya, mana ọ pụghị ime nke a, 20nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya. 21Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili. 22Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.” 23O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m.” 24Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.” 25Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.” 26O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya. 27Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ, 28tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya. 29Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie. 30Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 11 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike