Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 9 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 27 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 12 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Pœmen the Great († c. 450)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke. 2Megheenụ obi unu nabata anyị, nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọbụla anyị rigburu. 3Anaghị m ekwu ihe ndị a ka m maa unu ikpe, dịka m kwuburu na mbụ, na anyị bu unu nʼobi anyị, ịdịkọ ndụ, maọbụ ịnwụkọkwa ọnwụ nʼotu. 4Nkwuwa okwu m ji gwa unu okwu dị ukwuu; ịnya isi m nʼihi unu dịkwa ukwuu. Abụ m onye a gbara ume nʼebe ọ dị ukwu, nʼime ọnọdụ ahụhụ anyị niile, ana m aṅụrịbiga ọṅụ oke. 5Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime. 6Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nʼọbịbịa Taịtọs. 7Ọ bụkwaghị naanị nʼihi na ọbịbịa ọ bịara nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si gbaa ya ume, gwakwa anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru ụjụ nʼihi ihe niile mere, na otu unu si guzosie ike nʼukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nʼebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu. 8Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nʼihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla naanị nke nwa oge nta. 9Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nʼihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nʼihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nʼihi akwụkwọ anyị deere unu. 10Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ.
Oziọma
29Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru. 30Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya. 31Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa. 32Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha. 33Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ. 34Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ. 35Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 27 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 9 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike