Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 10 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 28 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Septemba 2027

Fraịdee · Izu nke 12 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Moses the Black of Scete († c. 400)

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Mat 11:27–30

27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

Akwụkwọ ozi

2Kọ 7:10–16

10Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ. 11Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile. 12Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nʼihi onye ahụ mehiere, maọbụ nʼihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Chineke gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nʼobi. 13Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ. A gbara anyị ume karịa site na ịhụ ọṅụ Taịtọs nʼihi nnabata unu nabatara, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu. 14Nʼihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyara m isi nʼihu ya banyere unu; ugbu a, obi dị m ụtọ nke ukwuu nʼihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a, ịnya isi m nʼebe Taịtọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu. 15Ugbu a, ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nʼihi ncheta ọ na-echeta otu unu niile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya. 16Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nʼihi na enwere m ntụkwasị obi nʼebe unu nọ nʼime ihe niile.

Akwụkwọ ozi (maka Satọdee)

1Kọ 1:26–29

26Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo. 27Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike. 28Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru. 29Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Job)

Gal 5:22–6:2

22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.

Oziọma

Mak 2:18–22

18Nʼoge a, ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. Ndị mmadụ bịara jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị nke gị adịghị ebu ọnụ?” 19Jisọs sịrị ha, “O kwesiri na ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwunye ga-ebu ọnụ mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ nʼetiti ha? Ha apụghị ibu ọnụ ogologo oge ya na ha nọ. 20Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Nʼụbọchị ahụ ka ha ga-ebu ọnụ. 21“Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa. Ọ bụrụ na o mee nke a, akwa ọhụrụ ahụ ga-adọkapụ site na nke ochie mee ka ndọka ya dị njọ karịa. 22Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”

Oziọma (maka Satọdee)

Mat 20:29–34

29Mgbe ha na-ahapụ Jeriko, ọtụtụ igwe mmadụ sooro ya nʼazụ. 30Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 31Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 32Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 33Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.” 34Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.

Oziọma (maka Onye nsọ Job)

Luk 6:17–23

17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 28 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 10 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike