Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 9 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 23 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Pita Claver, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
12Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi. 13Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu. 14Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu. 15Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele. 16Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu. 17Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya. 2Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile. 3Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya, 4jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya, 5werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya. 6Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.
Oziọma
27“Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma. 28Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere. 29Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị. 30Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya. 31Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha. 32“Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ọbụladị ndị mmehie, ọ bụ ndị hụrụ ha nʼanya ka ha na-ahụkwa nʼanya. 33Ọ bụrụkwa naanị ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka. 34Ọ bụrụkwa na unu agbazinye naanị ndị nwere ike ịkwụghachi unu ihe, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ibe ha na-atụ anya ka a kwụghachikwa ha nʼozuzu oke. 35Hụnụ ndị iro unu nʼanya, na-emekwa ezi ihe nye ha, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Mgbe ahụ, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ nke Onye kachasị ihe niile elu, nʼihi na ebere ya na-adịrị ndị ajọ omume na ndị na-enweghị mmụọ ekele nʼime ha. 36Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si nwee obi ebere. 37“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu. 38Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na ọ bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Pita Claver, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike