Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 8 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 26 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Septemba 2027
Wenezdee · Izu nke 12 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Meeting of the Vladimir Icon of the Most Holy Mother of God (1395)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” 46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
Akwụkwọ ozi
11Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe niile dị anyị nʼobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu. 12Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ. 13Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ. 14Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ? 15Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ? 16Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”
Akwụkwọ ozi (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
5Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst: 6Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike. 7Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ. 8Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe. 9Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. 10Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. 11Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
Oziọma
23Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu, 24sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.” 25Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!” 26Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta. 27Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.” 28Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.
Oziọma (maka Aịkọn Vladimir nke Nne Chineke)
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.” 11:27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.” 28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 8 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike