Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 2 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 22 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 22 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
9Nʼihi nke a, site nʼụbọchị anyị nụrụ ihe banyere ya, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-arịọ ka unu jupụta nʼamamihe nke uche ya, nʼime nghọta ma amamihe nke mmụọ niile. 10Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ịma Chineke mgbe niile. 11Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi, 12na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè. 13Nʼihi na ọ napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. 14Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile.
Abụ Ọma nzaghachi
2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ; 5werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma, 6jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
Oziọma
1Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke. 2Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ. 3Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe. 4Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.” 5Saimọn zara sị, “Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile.” 6Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị. 7Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu. 8Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.” 9Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. 10Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, “Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ.” 11Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike