Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 3 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Septemba 2027
Fraịdee · Izu nke 22 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 22 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Gregori Onye Ukwu, Pope na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
15Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke. 16Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya. 17Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu. 18Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile. 19Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi. 20Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. 2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya 3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. 4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya. 5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Oziọma
33Ha sịrị, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere oge niile, ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri, na-aṅụkwa.” 34Jisọs sịrị ha, “Ndị a kpọrọ oriri nʼọlụlụ di na nwunye, ha ga-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ? 35Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.” 36Ọ tụụrụ ha ilu a, “O nweghị onye na-adọkara akwa ọhụrụ were ya kwachie akwa ochie. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọ pụtara na a dọwaala akwa ọhụrụ ahụ nʼihi na nke ahụ eji kwachie ya agaghị adaba. 37Nʼụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị agbanye mmanya ọhụrụ dị ike nʼime karama akpụkpọ ochie. Nʼihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama ahụ a laa nʼiyi. 38Ma ọ dị mma ịgbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ. 39O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nʼihi na ọ ga-asị, ‘Nke ochie ahụ ka mma.’ ”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Gregori Onye Ukwu, Pope na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike