Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 2 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 20 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Septemba 2027
Tọọzdee · Izu nke 11 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Dormition
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi. 2Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke. 3Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi. 4Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya. 5Nʼihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma anyị onwe anyị bụ ụmụodibo unu nʼihi Jisọs. 6Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst.
Oziọma
13Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. 14A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa. 15“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara). 16Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu. 17Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya. 18Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya. 19Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ 20Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike. 21Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ. 22“Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ. 23Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 24Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara. 25Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị. 26“Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela. 27Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ. 28Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 2 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike