Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 1 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Septemba 2027
Wenezdee · Izu nke 22 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 22 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Pọl, onye e mere onyeozi Kraịst Jisọs, site nʼọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti, 2Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu. 3Mgbe ọbụla anyị na-ekpere unu ekpere anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele. 4Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya. 5Okwukwe na ịhụnanya nke na-esite nʼolileanya nke a kwadobere unu nʼeluigwe, nke unu nụrụla nʼokwu nke eziokwu ahụ, bụ oziọma, 6nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu. 7Dị ka unu siri mụta nʼaka Epafras, onye anyị hụrụ nʼanya na onye anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼijere Kraịst ozi nʼaha unu. 8O meela ka anyị mara ụdị ịhụnanya unu nwere nʼime Mmụọ.
Abụ Ọma nzaghachi
8Ma adị m ka osisi oliv, nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke, nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi. 9Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere; aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ. Olileanya m ga-adị nʼime aha gị, nʼihi na aha gị dị mma.
Oziọma
38Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka. 39O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa. 40Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha. 41Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst. 42Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha. 43Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze Chineke nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.” 44Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na Judịa.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike