Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 29 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 16 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 29 Ọgọọst 2027

Sọnde · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 10 mgbe Pentikọọsụ gasịrị

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 10

Jọn 21:1–14

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee. 2Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. 3Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla. 4Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs. 5Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.” 6Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya. 7Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. 8Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. 9Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha. 10Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.” 11Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya. 12Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị. 13Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ. 14Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.

Akwụkwọ ozi

1Kọ 4:9–16

9Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. 10Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ. 11Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. 12Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. 13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. 14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. 15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. 16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.

Akwụkwọ ozi (maka Onyinyo aka ọ bụla na-emeghị)

Kọl 1:12–18

12na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè. 13Nʼihi na ọ napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya. 14Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile. 15Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke. 16Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya. 17Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu. 18Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile.

Oziọma

Mat 17:14–23

14Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, 15rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. 16Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.” 17Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.” 18Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ. 19Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?” 20Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime. 21Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ.” 22Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ. 23Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu.

Oziọma (maka Onyinyo aka ọ bụla na-emeghị)

Luk 9:51–56; 10:22–24

51Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem. 52O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa; 53ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem. 54Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?” 55Ọ tụgharịrị bara ha mba. 56Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ. 10:22“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara ahụ bụ, karịa Nna ahụ. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara na ndị ahụ Ọkpara chọrọ igosi onye Nna ya bụ.” 23Mgbe ahụ ọ tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzị na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ ugbu a. 24Ana m asị unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 29 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike