Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 29 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Ọgọọst 2027

Sọnde · Izu nke 22 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 22 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dit 4:1–2, 6–8

1Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu. 2Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu. 6Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.” 7Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka Onyenwe anyị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere? 8Olee mba ukwu ọzọ dịkwa nke nwere ụkpụrụ na iwu ziri ezi dịka iwu ndị a m na-enye unu taa?

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 15:2–5

2Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, onye na-arụ ọrụ ezi omume, onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya. 3Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya, 4onye na-eleda onye ajọ omume anya, ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya, 5onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. Onye na-eme ihe ndị a agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Jem 1:17–18, 21–22, 27

17Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya. 18Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke. 21Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu. 22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. 27Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.

Oziọma

Mak 7:1–8, 14–15, 21–23

1Mgbe ndị Farisii na ụfọdụ ndị ozizi iwu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu, 2ha hụrụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka na-adịghị ọcha, ya bụ aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri. 3Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye. 4Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ. 5Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?” 6Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. 7Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’ 8Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.” 14Ọzọkwa, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ sị ha, “Geenụ m ntị onye ọbụla, ma ghọtakwanụ nke a. 15Ọ dịghị ihe ọbụla banyere nʼime mmadụ pụrụ imerụ mmadụ, kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nʼime ya na-apụta.” 21Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ, 22ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye, ọchịchọ ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, ekworo, aghụghọ niile, adịghị ọcha niile, inwe anya ụfụ nʼebe ndị ọzọ nọ, nkwulu niile, nganga na enweghị uche ọbụla. 23Ihe ọjọọ ndị a niile na-esite nʼime mmadụ a pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike