Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 30 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 17 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Ọgọọst 2027

Mọnde · Izu nke 11 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Dormition

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 2:3–15

3E deere unu akwụkwọ a dịka m kwesiri ime ka m ghara inwe mwute mgbe m bịara, site nʼaka ndị kwesiri ime ka obi dị m mma, nʼihi na o doro m anya na ọṅụ m ga-abụ ọṅụ nke unu niile. 4Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ. 5Ọ bụrụ na onye ọbụla mere ihe butere obi mgbu, ka a hapụ ikwu ya karịa ka o kwesiri, ọ bụghị naanị m ka o wetaara obi mgbu, o wetakwaara unu niile obi mgbu. 6Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola. 7Ugbu a, bikonu ụmụnna m, o kwesiri ka unu gbaghara ya, ma kasịe ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu maọbụ daa mba na mmụọ ya, rubiga ụjụ oke. 8Ya mere ana m arịọ unu, bikonu, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nʼanya. 9Ihe mere m ji dee ihe m dere nʼakwụkwọ nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe niile irube isi nʼihe niile. 10Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ahụ mụ onwe m kwa agbagharala ya. Mgbaghara m, a sịkwa na o nwere ihe m na-agbaghara, ana m eme ya nʼihi unu nʼihu Kraịst. 11Anyị na-eme nke a ka Ekwensu ghara ịghọgbu anyị. Anyị maara ihe niile ọ na-ezube. 12Mgbe m bịarutere Troas ikwusa oziọma Kraịst, e megheere m ụzọ nʼime Onyenwe anyị. 13Ma enweghị m izuike nʼime obi m, nʼihi na ahụghị m Taịtọs ezi nwanna m nʼebe ahụ. Nke a mere m jiri kelee ha hapụ ha gawa Masidonia. 14Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya. 15Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi.

Oziọma

Mat 23:13–22

13“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata. 14“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ, ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ogologo ekpere ka mmadụ hụ unu. Unu ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu. 15“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu. 16“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru ìsì! Nʼihi na unu na-asị, Onye ọbụla jiri ụlọnsọ ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla jiri ọlaedo dị nʼime ụlọnsọ ṅụọ iyi kwesiri imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ. 17Ndị nzuzu kpuru ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọnsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ? 18Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla ga-eji onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’ 19Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ? 20Ya mere, mgbe onye ọbụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nʼelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ. 21Otu a kwa, onye ji ụlọnsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọnsọ ahụ na onye bi nʼime ya na-aṅụ iyi. 22Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nʼelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 30 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike