Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 28 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Ọgọọst 2027

Satọdee · Izu nke 21 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 21 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Ọgọstin nke Hipo, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Te 4:9–11

9Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ. 10Ma nʼezie, unu na-ahụ ụmụnna anyị niile bi na Masidonia nʼanya. Ma anyị na-arịọsịkwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nʼanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a. 11Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu,

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 98:1, 7–9

1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 7Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 8Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ; 9ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.

Oziọma

Mat 25:14–30

14“Ọzọ, ọ ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. 15O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ ọ hapụrụ ha gaa ije ya. 16Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. 17Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. 18Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma. 19“Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. Ọ kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. 20Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘Ị nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!’ 21“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ 22“Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’ 23“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’ 24“Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị. 25Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’ 26“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. 27Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri. 28“ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. 29Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere. 30Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike