Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 27 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Ọgọọst 2027

Fraịdee · Izu nke 21 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 21 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Monika · Ncheta

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Te 4:1–8

1Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa. 2Nʼihi na unu maara ụdị ndụmọdụ ahụ sị nʼaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu. 3Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko, 4ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ. 5Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke. 6Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike. 7Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ. 8Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 97:1–2, 5–6, 10–12

1Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. 2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya. 5Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile. 6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya. 10Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị, nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume. 11Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi. 12Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, tookwanụ aha nsọ ya.

Oziọma

Mat 25:1–13

1“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. 2Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. 3Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. 4Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. 5Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra. 6“Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’ 7“Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. 8Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’ 9“Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’ 10“Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ. 11“Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’ 12“Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’ 13“Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike