Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 27 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 14 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Ọgọọst 2027

Fraịdee · Izu nke 10 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Forefeast of the Dormition of the Mother of God

Obubu ọnụ Ndaba ụra

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

2Kọ 1:12–20

12Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ. 13Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma. 14Dịka unu ghọtarala anyị nwa nke nta ugbu a, unu ga-eji anyị anya isi nʼụbọchị nke Onyenwe anyị Jisọs. 15Ihe m na-ekwu were m anya, nke mere m ji chọọ ibu ụzọ bịa leta unu ka unu nwee uru abụọ. 16Ebu m ya nʼobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nʼobi m na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judịa. 17E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ? 18Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.” 19Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.” 20Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.

Akwụkwọ ozi (maka Satọdee)

Rom 15:30–33

30Esi m nʼaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu Chineke. 31Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata. 32Ka ọ ga-abụ site nʼuche Chineke, aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu. 33Ka Chineke ahụ na-enye udo, nọnyere unu niile. Amen.

Oziọma

Mat 22:23–33

23Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ. 24Onye ozizi, “Mosis kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa. 25Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya. 26Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa. 27Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 28Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?” 29Jisọs zara ha sị, “Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere. 30Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 31Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị, 32Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.” 33Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya.

Oziọma (maka Satọdee)

Mat 17:24–18:4

24Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?” 25Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?” 26Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ. 27Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.” 18:1Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, “Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?” 2Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha, 3ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. 4Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 27 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike