Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 26 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Ọgọọst 2027
Tọọzdee · Izu nke 21 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 21 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
7Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu. 8Ugbu a anyị ga-adị ndụ, ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike nʼime Onyenwe anyị. 9Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nʼihi akụkọ nyere anyị ọṅụ nʼihu Chineke anyị nʼihi unu. 10Ehihie na abalị niile, anyị na-arịọ ka anyị hụ unu ihu na ihu, ka anyị nwee ike tinyezuo ihe fọdụrụ nʼokwukwe unu. 11Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu. 12Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ. 13Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.
Abụ Ọma nzaghachi
3Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.” 4Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị; ha dịka ụnyaahụ gafere agafe maọbụ ka otu awa nke anyasị. 12Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara. 13O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere. 14Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile. 17Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị; mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike, e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.
Oziọma
42“Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. 43Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya. 44Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya. 45“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya? 46Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a. 47Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere. 48Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’ 49ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ. 50Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. 51Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike