Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 25 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 12 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Ọgọọst 2027
Wenezdee · Izu nke 10 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Transfiguration of the Lord
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
4Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro. 5Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ Masidonia abịa. 6Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ. 7Nʼihi na-achọghị m ileta unu ugbu a m nọ nʼije ngafere. Kama ana m ezube ịbịa nọnyere unu nwa oge, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị e kwenye. 8Ma aga m anọ nʼEfesọs tutu ruo oge Pentikọọsụ, 9nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m. 10Ọ bụrụ na Timoti abịa, lezienụ anya mee ka ọ ghara inwe ihe ọ ga-atụ egwu mgbe ọ nọ nʼetiti unu, nʼihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dịka m si arụ ya. 11Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya. 12Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara.
Oziọma
28“Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’ 29“Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ. 30“Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị. 31“Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke. 32Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 25 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike