Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 25 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Ọgọọst 2027

Wenezdee · Izu nke 21 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 21 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Josef nke Calasanz, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Louis · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

1Te 2:9–13

9Nʼezie ụmụnna m, amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ hụjuokwa anya nʼetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nʼihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọbụla mgbe anyị na-ezisara unu oziọma Chineke. 10Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe dị ka Chineke si bụrụ onye akaebe, na mmekọrịta anyị na unu bụ ndị kwere ekwe, bụ nwekọrịta dị ọcha na nke ezi omume, na nke ịta ụta ọbụla na-adịghị na ya. 11Nʼihi na anyị mesoro onye ọbụla nʼime unu dị ka nna si emeso ụmụ nke ya, 12na-agba unu ume, na-akasị unu obi, na-akwagidekwa unu na unu kwesiri ibi ndụ kwesiri ụmụ Chineke, onye kpọbatara unu nʼime alaeze ya na ebube ya. 13Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 139:7–12

7Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m? 8Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. 9Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri, 10ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike. 11Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.” 12Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.

Oziọma

Mat 23:27–32

27“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha. 28Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume. 29“E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume. 30Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma. 31Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma. 32Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike