Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 24 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 11 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Ọgọọst 2027
Tiuzdee · Izu nke 10 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Transfiguration of the Lord
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
29Ma ọ bụghị otu a, gịnị mere ụfọdụ ji eme ndị otu ha baptizim nʼọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie ma ọlị, nʼihi gịnị ka a na-eme mmadụ ndị a baptizim nʼọnọdụ ha? 30Gịnị mere anyị ji nọrọ nʼize ndụ nʼoge awa ọbụla? 31Nʼịgwa unu eziokwu, ụmụnna m, ana m ezute ọnwụ kwa ụbọchị. Ihe m ji kwupụta nke a bụ nʼihi ịnya isi nke m ji unu anya nʼime Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị. 32Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi anyị ga-anwụ.” 33Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa. 34Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu. 35Ma ụfọdụ ga-ajụ, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-enwe mgbe ha ga-apụta?” 36Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ. 37Mgbe ị na-agha mkpụrụ, ọ bụghị anụ ahụ nke ga-apụta ka ị na-agha, kama ọ bụ naanị mkpụrụ nkịtị, eleghị anya mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ mkpụrụ ọzọ. 38Ma Chineke na-enye ya ahụ dịka o si chọọ. Ọ na-enyekwa mkpụrụ ọbụla nʼime mkpụrụ niile ahụ nke kwesiri ya.
Oziọma
23Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?” 24Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile. 25Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?” Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 26Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.” 27Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 24 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike