Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 24 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Ọgọọst 2027

Tiuzdee · Izu nke 21 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Onye nsọ Batalomi, Onyeozi

Mmemme · Agba ofufe: uhie

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Mkp 21:9–14

9Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” 10O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. 11O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal. 12Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu. 13Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 14Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 145:10–13, 17–18

10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. 11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị, 12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị. 13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 17Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 18Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.

Oziọma

Jọn 1:45–51

45Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.” 46Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?” Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.” 47Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.” 48Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.” 49Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.” 50Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.” 51Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike