Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 23 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 10 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Ọgọọst 2027
Mọnde · Izu nke 10 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Afterfeast of the Transfiguration of the Lord
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
12Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Kraịst si nʼọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nʼọnwụ bilie ọzọ. 13Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ a pụghị i si nʼọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nʼọnwụ bilie. 14Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu. 15Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ. 16Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie. 17Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu. 18Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi. 19Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere.
Oziọma
18Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 19Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. 20Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?” 21Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa. 22Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 23 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike