Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 23 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Ọgọọst 2027
Mọnde · Izu nke 21 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 21 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Roz nke Lima, Nwaagbọghọ · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Akwụkwọ ozi a si nʼaka Pọl, Saịlas na Timoti. Na-abịara nzukọ dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka amara na udo dịrị unu. 2Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị. 3Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 4Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nʼanya nke ukwuu, họpụta unu. 5Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu. 8Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya. 9Nʼihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nʼikpere arụsị tụgharịa, bido ife Chineke dị ndụ, onye bụkwa ezi Chineke, 10na i chere Ọkpara ya onye ga-esi nʼeluigwe, onye o sitere na ndị nwụrụ anwụ kulite, Jisọs, onye na-anapụta anyị nʼiwe nke na-abịa.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị! Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. 2Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha. 3Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. 4Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. 5Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. 6Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha, 9imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu Onyenwe anyị.
Oziọma
13“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata. 14“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ, ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ogologo ekpere ka mmadụ hụ unu. Unu ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu. 15“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu. 16“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru ìsì! Nʼihi na unu na-asị, Onye ọbụla jiri ụlọnsọ ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla jiri ọlaedo dị nʼime ụlọnsọ ṅụọ iyi kwesiri imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ. 17Ndị nzuzu kpuru ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọnsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ? 18Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla ga-eji onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’ 19Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ? 20Ya mere, mgbe onye ọbụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nʼelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ. 21Otu a kwa, onye ji ụlọnsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọnsọ ahụ na onye bi nʼime ya na-aṅụ iyi. 22Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nʼelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Roz nke Lima, Nwaagbọghọ
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike