Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 22 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 9 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Ọgọọst 2027
Sọnde · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 9 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 9
19Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.” 24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” 26Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 27Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” 28Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!” 29Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.” 30Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. 31Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.
Akwụkwọ ozi
9Anyị so Chineke na-arụ ọrụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu. 10Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu. 11O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọala karịrị ntọala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọala ahụ. 12Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ, 13ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ. 14Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ. 15Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya. 16Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu? 17Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.
Oziọma
22Mgbe nke a gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ. 23Mgbe ọ zilagasịrị igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere, naanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, naanị ya nọkwa na-ebe ahụ. 24Ma nʼoge a ụgbọ mmiri ahụ esitela nʼebe ala dị nso gamie nʼelu osimiri, ebili mmiri na-ebugharịkwa ya, nʼihi na ifufe ahụ na-emegide ya. 25Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri. 26Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha tiri mkpu nʼihi egwu. 27Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, “Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu.” 28Pita zara ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri.” 29Ọ sịrị ya, “Bịa!” Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs. 30Ma mgbe ọ hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe ọ malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!” 31Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ sịrị ya, “Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!” 32Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara. 33Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.” 34Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha bịarutere nʼala Genesaret.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 22 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike