Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 15 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 2 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Ọgọọst 2027
Sọnde · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 8 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 8
11Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs. 13Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” 14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs. 15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” 16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)” 17Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ” 18Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.
Akwụkwọ ozi
10Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu. 11Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu. 12Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.” 13Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl? 14Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs. 15Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m. 16(Ahaa! Emekwara m Stefanas na ezinaụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nʼonwe m.) 17Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu. 18Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke.
Oziọma
14Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha. 15Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.” 16Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.” 17Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.” 18Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.” 19Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. 20Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. 21Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị. 22Mgbe nke a gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 15 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike