Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 10 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Ọgọọst 2027
Tiuzdee · Izu nke 19 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Onye nsọ Lọrens, Dikọn na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Mmemme · Agba ofufe: uhie
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. 7Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya. 8Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma. 9Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” 10Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.
Abụ Ọma nzaghachi
1Toonu Onyenwe anyị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 2Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 5Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile. 6Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya; a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi. 7Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ; obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi. 8Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri. 9Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu.
Oziọma
24Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. 26Onye ọbụla na-ejere m ozi aghaghị iso m; ebe m nọ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa. Onye ọbụla na-ejere m ozi ka Nna m ga-asọpụrụ.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Lọrens, Dikọn na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike