Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 11 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 29 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Ọgọọst 2027

Wenezdee · Izu nke 8 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Callinicus of Gangra in Asia Minor

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Kọ 10:12–22

12Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda. 13O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya. 14Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ. 15Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu. 16Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst? 17Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ. 18Chetanụ ka ndị Izrel siri mee: ọ bụ na ndị na-eri ihe eji chụọ aja abụghị ndị nnwekọ nʼebe ịchụ aja? 19Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Na arụsị, maọbụ ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị bụ ihe ọbụla, maọbụ na ọ bụghị ihe? 20Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu. 21Unu apụghị ịṅụ site nʼiko Onyenwe anyị ma ṅụọkwa site nʼiko ekwensu; unu apụghịkwa inwe oke site na tebul Onyenwe anyị na tebul ekwensu. 22Anyị na-achọ ime ka iwe wee Onyenwe anyị? Anyị dị ike karịa ya?

Oziọma

Mat 16:20–24

20Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ. 21Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie. 22Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!” 23Ma o chigharịrị sị Pita, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.” 24Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Julaị na kalenda nzukọ bụ 11 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike