Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 8 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Ọgọọst 2027
Sọnde · Izu nke 19 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 19 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
4Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.” 5O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra. Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.” 6Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ. 7Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.” 8Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. 2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. 3Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu. 4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. 5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. 6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. 7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. 8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
30Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta. 31Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu. 32Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst. 5:1Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya. 2Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ.
Oziọma
41Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.” 42Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?” 43Jisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu. 44O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ. 45E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’ Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m. 46O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ. 47Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi. 48Abụ m achịcha nke ndụ. 49Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ. 50Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ. 51Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Dọminik, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike