Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 7 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 25 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Ọgọọst 2027

Satọdee · Izu nke 7 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Dormition of the Righteous Anna, Mother of the Most Holy Theotokos

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 12:1–3

1Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu. 2Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke. 3Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Ana)

Gal 4:22–31

22Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ na Ebraham nwere ụmụ nwoke abụọ. Otu nʼime ha bụ nwa nke ohu ya nwanyị mụrụ, nke ọzọ bụ nke nwunye ya na-abụghị ohu mụtara. 23Nwa ahụ nke ohu nwanyị ahụ mụrụ bụ onye amụrụ site na anụ ahụ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ onye a mụrụ site na nkwa. 24Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega. 25Hega bụ Ugwu Saịnaị nke dị nʼArebịa. Ọ dabara nʼọnọdụ Jerusalem nke ugbu a, nʼihi na ya na ụmụ ya nọ nʼohu. 26Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị. 27Nʼihi na e dere ya, “Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga, onye na-amụtaghị nwa. Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ike gị onye ime nwa na-emetụbeghị, nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.” 28Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik. 29Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a. 30Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.” 31Ya mere, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke nwanyị ohu, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị nwere onwe ya.

Oziọma

Mat 10:37–11:1

37“Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. 38Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m. 39Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya. 40“Ndị niile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Onye ahụ zitere m ka ha na-anabata. 41Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume. 42Ọ bụrụ na onye ọbụla ekunye otu nʼime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nʼihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, nʼezie, asị m unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.” 11:1Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma.

Oziọma (maka Onye nsọ Ana)

Luk 8:16–21

16“Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ. 17Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè. 18Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.” 19Nʼoge a, nne ya na ụmụnne ya nwoke bịakwutere ya. Ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nʼihi igwe mmadụ. 20Otu onye gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo nʼezi, ha chọrọ ịhụ gị.” 21Ọ zara sị, “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ya mere ihe.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Julaị na kalenda nzukọ bụ 7 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike