Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 7 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Ọgọọst 2027

Satọdee · Izu nke 18 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 18 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Kajetan, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Sikstọs nke Abụọ, Pope, na ndị otu ya, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dit 6:4–13

4Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 5Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya. 6Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi. 7Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie. 8Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. 9Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị. 10Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị, 11na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ, 12leruonu anya, ka unu ghara ichefu Onyenwe anyị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu. 13Onyenwe anyị bụ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu, naanị ya ka ị ga-efe ofufe, ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 18:1–3, 46, 50

1Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. 2Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. 3Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 46Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m. 50Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

Oziọma

Mat 17:14–20

14Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, 15rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. 16Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.” 17Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.” 18Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ. 19Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?” 20Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike