Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 6 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 24 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Ọgọọst 2027
Fraịdee · Izu nke 7 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Christina of Tyre († c. 300)
Ụbọchị obubu ọnụ
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
9Mba niile dị iche iche ezukọtala, mmadụ niile agbakọtakwala. Onye nʼime chi ha kwuru na ihe dị otu a ga-eme, onye kwa kwuru ihe ndị a mere nʼoge gara aga? Ka ha kpọbata ndị akaebe ha izipụta na ihe ha kwuru ziri ezi, ka ndị ọzọ nụ ya ma sị na, “Ọ bụ eziokwu.” 10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. 11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m. 12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị chi ndị mba ọzọ nọ nʼetiti unu. Unu bụkwa ndị akaebe m, na mụ onwe bụ Chineke,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m ihe m ji nʼaka. Mgbe m rụrụ ọrụ, onye pụrụ ịgbanwe ya?” 14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta unu na Onye nsọ nke Izrel. “Nʼihi unu, aga m eziga ozi na Babilọn budata ndị Kaldịa niile dịka ndị gbapụrụ agbapụ, nʼime ụgbọ mmiri ahụ niile ha ji anya isi.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
12“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. 13Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. 14Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. 15Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide. 16Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu. 17Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 18Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. 19Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.
Akwụkwọ ozi
35Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ. 36Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye. 37Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere. 38Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa. 39Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị. 40Nʼuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nʼobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na mụ onwe m nwekwara Mmụọ nke Chineke. 8:1Ugbu a, nʼokwu banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị ma na onye ọbụla nwere amamihe. Amamihe na-afụli mmadụ elu mee ka ọ nyaa isi. Ma ịhụnanya na-ewuli elu. 2Ọ bụrụ na ọ dị onye sị na ya maara ihe niile, onye ahụ amatabeghị ihe o kwesiri ịmata. 3Ma onye ahụ hụrụ Chineke nʼanya bụ onye ọ maara. 4Ya mere, ihe banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị maara na “Arụsị abụghị ihe ọbụla nʼụwa”, matakwa na “Chi ọzọ adịghị ma ọ bụghị otu Chineke.” 5A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nʼeluigwe maọbụ nʼụwa (nʼezie ọtụtụ “chi” na “ndị nwe mmadụ” dị otu a dị). 6Ma nʼebe anyị nọ, anyị maara na ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye kere ihe niile, na onye anyị na-adị ndụ nʼihi ya. Ọ bụkwa naanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼaka ya kee ihe niile, onye na-enyekwa anyị ndụ. 7Ma otu ọ dị, ọ bụghị onye ọbụla nwere ihe ọmụma a. Ụfọdụ nʼime ndụ ha niile, ha na-ele arụsị anya dịka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọrọ aja. Nʼihi nke a, mgbe ọbụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nʼihi na akọnuche ha esighị ike, ọ na-emerụkwa ya.
Akwụkwọ ozi (maka Ndị nsọ Boris na Gleb)
28Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. 29Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna. 30Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto. 31Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị? 32Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya? 33Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume. 34Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ. 35Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha? 36Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.” 37Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. 38Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, 39maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
Oziọma
29Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nʼelu ugwu nọdụ ala. 30Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile. 31Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel.
Oziọma (maka Ndị nsọ Boris na Gleb)
17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya. 18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ 26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. 16:1“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. 2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Julaị na kalenda nzukọ bụ 6 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike