Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 31 Julaị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 31 Julaị 2027
Satọdee · Izu nke 17 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 17 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Ignatiọs nke Loyola, Onye ụkọchukwu · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị sị ya, 8“ ‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu. 9Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa, zipụ onye ga-egbu opi ike, ya bụ, nʼụbọchị mkpuchi mmehie, a ga-egbu opi ike nʼala Izrel niile. 10Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya. 11Afọ nke iri ise bụ afọ inwere onwe nye unu. A gaghị akụ ihe ọbụla nʼubi, a gakwaghị ewe ihe ubi ọbụla puputara nʼonwe ya, maọbụ mkpụrụ osisi vaịnị mịrị nʼonwe ya. 12Ọ bụ afọ inwere onwe, bụrụkwa afọ dị nsọ nye unu, nke onye ọbụla ga-eri naanị ihe e wetara nʼubi. 13“ ‘Onye ọbụla ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ya, nʼafọ inwere onwe a. 14“ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu. 15Ị ga-azụrụ ala site nʼaka onye agbataobi dịka ọnụọgụgụ afọ si dị site nʼafọ inwere onwe. Ha ga-eresi gị ya dịka ọnụọgụgụ afọ ole fọdụrụ maka ịkọ ihe nʼala ahụ. 16Ọ bụrụ na a zụrụ ala ahụ nso nso mmemme iri afọ ise a, ọnụahịa ala ahụ ga-adị ala, ọ bụrụkwanụ na ọ dị anya site na mmemme ahụ, ọnụahịa ya ga-adị elu, nʼihi na ụgwọ onye ahụ na-akwụ bụ ụgwọ ugboro ole ọ ga-akụ ihe nʼala ahụ. 17Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela 2Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. 4Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela 6Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị. 7Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
Oziọma
1Nʼoge a Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs. 2Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. O sitela na ndị nwụrụ anwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere ike ịrụ ọrụ ebube ndị a ji dị nʼime ya.” 3Nʼihi na, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nʼụlọ mkpọrọ, nʼihi Herodịas nwunye Filip nwanne ya nwoke. 4Nʼihi na Jọn gwara ya, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ ya.” 5Herọd chọrọrị igbu ya, ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha weere Jọn dị ka onye amụma. 6Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. 7Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ. 8Ma dị ka nne ya si haziere ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, “Nye m isi Jọn omee baptizim nʼefere ugbu a.” 9Arịrịọ a wutere eze Herọd, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ na nʼihi ndị ọbịa ya niile, ọ chọghị ịla azụ nʼokwu ya. O nyere iwu ka e meere ya ihe ọ chọrọ. 10O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 11E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya. 12Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Ignatiọs nke Loyola, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike