Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 28 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 15 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Julaị 2027

Wenezdee · Izu nke 6 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Quriaqos and his mother Julitta

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Vladimir)

1Ez 8:22–23, 27–30

22Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu, 23kwuo sị, “ Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị. 27“Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị? 28Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị taa. 29Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, abalị na ehihie, bụ ebe a i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị nʼebe ahụ,’ ka i si otu a nụrụ ekpere nke ohu gị ga-ekpe banyere ebe a. 30Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Vladimir)

Aịz 61:10–62:5

10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma. 11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta, dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto pupụta nʼihu mba niile. 62:1Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu. 2Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị. 3Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị. 4A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye. 5Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka Onye na-ewu gị ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Vladimir)

Aịz 60:1–16

1“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ. 2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ. 3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị. 4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị. 6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị. 7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda. Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị. A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m. Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa. 8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha? 9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere; ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya, ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile. Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị. 10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere. 11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha. 12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha. 13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị. Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres, ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma. Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile. 14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel. 15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị. 16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Jọn 10:9–16

9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri. 10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke. 11“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya. 12Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha. 13Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ. 14“Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m. 15Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ. 16Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Vladimir)

Gal 1:11–19

11Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya. 12Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m. 13Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya. 14Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha. 15Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, 16ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya. 17Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs. 18Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise. 19Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.

Oziọma (maka Onye nsọ Vladimir)

Jọn 10:1–9

1“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe. 2Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. 3Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ. 4Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya. 5Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.” 6Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha. 7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ. 8Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị. 9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Julaị na kalenda nzukọ bụ 28 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike