Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 27 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 14 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Julaị 2027
Tiuzdee · Izu nke 6 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Apostle of the 70: Aquila (1st C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst site nʼọchịchọ Chineke, na nwanna anyị nwoke Sostenis, 2Ọ bụ unu nzukọ Chineke dị na Kọrint ka a na-edere akwụkwọ a, ndị e doro nsọ nʼime Kraịst Jisọs, na ndị a kpọrọ ibi ndụ dị nsọ, tinyere ndị ahụ niile na-akpọku aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye bụ Onyenwe ha na Onyenwe anyị: 3Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 4Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs. 5Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya. 6Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu. 7Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 8Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.
Akwụkwọ ozi (maka Wenezdee)
9Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.” 10Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi. 11Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke. 12Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị. 13Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ. 14Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ. 15Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta. 16Nʼihi na, “Onye maara uche Onyenwe anyị ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?” Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst. 3:1Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dịka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nʼime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dịka ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị bụ ụmụntakịrị nʼime Kraịst. 2Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike. 3Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa. 4Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa? 5Onye bụ Apọlọs? Onye bụ Pọl? Ọ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu oziọma unu kweere nʼime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dịka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ. 6Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ ahụ, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, maọbụ Chineke mere ka o too. 7Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa. 8O nweghị ihe dị iche nʼetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bu nʼobi. Onye ọbụla ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
Oziọma
24Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụ nʼubi ya. 25Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa. 26Mgbe mkpụrụ ọka wiiti ndị ahụ puputara, mepụta isi ọka, ahịhịa ahụ bidokwara ito. 27“Ndị ọrụ onye nwe ubi ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ nʼubi gị? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’ 28“Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ “Ndị ọrụ ya jụrụ ya sị, ‘Ị chọrọ ka anyị gaa fopụtasịa ha?’ 29“Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị, nʼihi na mgbe unu na-achọ ihopu ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site na-amaghị ama hopu ezi mkpụrụ ọka wiiti. 30Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’ ”
Oziọma (maka Wenezdee)
31Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya. 32Ọ bụ ezie na ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ nʼubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” 33Ọ tụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka ihe na-eko achịcha, nke nwanyị na-ewere gwakọta nʼụtụ ọka e ji eme achịcha, tutu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ niile koo.” 34Oge niile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. 35O mere nke a ka okwu onye amụma kwuru mezuo, sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọbụla na-amaghị site nʼoge e kere ụwa.” 36Emesịa, ọ hapụrụ igwe mmadụ ahụ baa nʼụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nʼubi a kụrụ ọka.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Julaị na kalenda nzukọ bụ 27 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike