Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 24 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 11 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Julaị 2027
Satọdee · Izu nke 5 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Remembrance of the Miracle of Saint Euphemia the All-Praiseworthy
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
14Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. 15Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.” 16Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke. 17Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya. 18Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. 19Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke. 20Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya, 21na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke.
Oziọma
9Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya. 10Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri. 11Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?” 12Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa. 13Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Julaị na kalenda nzukọ bụ 24 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike