Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 23 Julaị

Kalenda Ọtọdọks · 10 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Julaị 2027

Fraịdee · Izu nke 5 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Holy 45 Martyrs at Nicopolis in Armenia († c. a 319): Leontius, Mauricius, Daniel, Anthony, Alexander, Meneus, Janicita, Sisinius, Biriladus, and others

Ụbọchị obubu ọnụ

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Mat 11:27–30

27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”

Akwụkwọ ozi

Rom 16:1–16

1Ana m eme ka unu mata nwanna anyị nwanyị, Fibi, onye na-ejere nzukọ ozi na chọọchị dị nʼobodo Senkria. 2Biko nabatanụ ya nʼime Onyenwe anyị dịka o kwesiri ndị ya. Nyekwaranụ ya aka nʼụzọ niile unu nwere ike, nʼihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị ọzọ aka. 3Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs. 4Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha. 5Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile. 6Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu. 7Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst. 8Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị. 9Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m. 10Otu a kwa, keleenụ Apelis onye anwapụtarala nguzosike ya nʼime Kraịst. Keleenụ ndị ezinaụlọ Aristobulọs. 11Keleerenụ m Herodian onye ikwu m. Keleekwanụ ndị bi nʼụlọ Nasisọs. Ha bụ ndị nke Chineke. 12Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa ndị a na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleekwanụ Pesis, onye m hụrụ nʼanya na onye na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike. 13Keleere m Rufọs onye Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne. 14Ana m ekele unu Asinkritọs, Flegọn, Hamis, Patrobas, Hamis na ụmụnna anyị niile ndị ha na ha nọ. 15Keleerenụ m Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị nsọ niile ha na ha nọ. 16Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu. Nzukọ Kraịst niile nọ nʼebe a na-ekelekwa unu.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Antoni)

Gal 5:22–6:2

22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, 23ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. 24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. 25Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi. 26Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị. 6:1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu. 2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.

Oziọma

Mat 13:3–9

3O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya. 4Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo. 5Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi. 6Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala. 7Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha. 8Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị. 9Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

Oziọma (maka Onye nsọ Antoni)

Mat 4:25–5:12

25Ọtụtụ mmadụ sitere na Galili, Dekapọlịs, Jerusalem, Judịa na nʼofe osimiri Jọdan, soro ya. 5:1Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, 2o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị: 3“Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 4Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. 5Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. 6Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. 7Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. 8Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. 9Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. 10Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 11“Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. 12Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Julaị na kalenda nzukọ bụ 23 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike