Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 14 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Julaị 2027

Wenezdee · Izu nke 15 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 15 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Kamilọs de Lellis, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọpụ 3:1–6, 9–12

1Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke. 2Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ. 3Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.” 4Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.” 5Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.” 6Ọ sịrị, “Abụ m Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis zoro ihu ya, nʼihi na ọ tụrụ egwu ilegide Chineke anya. 9Ugbu a, akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụkwala m otu ndị Ijipt si na-emegbu ha. 10Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.” 11Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?” 12Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 103:1–4, 6–7

1Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile, 3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, 4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, 6Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu. 7O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:

Oziọma

Mat 11:25–27

25Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị. 26E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a. 27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike