Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 15 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 2 Julaị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Julaị 2027
Tọọzdee · Izu nke 4 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Placing of the Honorable Robe of the Most Holy Mother of God at Blachernæ (5th C)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
13Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m. 14Nʼihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nʼụzọ a kpasuo ekworo nʼime ụfọdụ ụmụnna m, ka e site nʼekworo ha zọpụta ụfọdụ nʼime ha. 15Ọ bụrụ na ọ bụ site nʼọjụjụ a jụrụ ha ka e siri mee ka ụwa dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ ga-adị ka i si nʼọnwụ bilie ọzọ, nwee ndụ ọzọ. 16Ebe ọ bụkwa na iberibe achịcha e jiri chụọ aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ, achịcha ahụ niile bụ ihe dị nsọ. Nʼihi na ọ bụrụ na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa, alaka ya ga-adịkwa nsọ. 17Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, werekwa unu bụ alaka osisi oliv ọhịa nyapagide nʼọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola keta oke na ngọzị sitere na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ. 18Ma unu ekwesighị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dochie nʼọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ naanị alaka dị nʼosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu. 19Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo, “Ma a nyakapụrụ alaka ụfọdụ e nwee ohere ebe a ga-anyapagide anyị.” 20Nke ahụ bụ eziokwu. Ma chetakwanụ na a nyakapụrụ ha nʼihi ekweghị ekwe ha, ma unu nọ naanị site nʼokwukwe. Ya mere anyala isi, kama na-atụ egwu. 21Nʼihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka nke osisi ahụ wapụtara nʼonwe ya ebere, ọ gaghị emekwara gị ebere. 22Ya mere, tulee obiọma na aka ike Chineke, aka ike nʼebe ndị dara ada nọ, ma obiọma nʼebe unu nọ, naanị mgbe unu na-anọgideghị nʼobi ebere ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-anyakapụkwa unu. 23Ma ọ bụrụ na ha anọgideghị na-ekweghị ekwe, a ga-anyapagidekwa ha nʼihi na Chineke pụrụ ịnyapagide ha ọzọ. 24Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha.
Oziọma
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Julaị na kalenda nzukọ bụ 15 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike