Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 5 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 22 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Julaị 2027
Mọnde · Izu nke 3 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Eusebius, Bishop of Samosata († 380)
Obubu ọnụ Ndị Ozi
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya? 2Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye. 3A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ. 4Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke. 5Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ. 6Ugbu a, a tọghapụla anyị pụọ nʼaka iwu ebe anyị nwụrụ nye ihe ndị kere anyị agbụ na mbụ, anyị anaghị ebikwa ndụ nʼusoro iwu ochie nke e dere nʼakwụkwọ, kama anyị na-eje ozi nʼusoro ndụ ọhụrụ nke mmụọ. 7Ugbu a, gịnị ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Nʼezie, mbaa! Agaraghị m ama ihe mmehie bụ ma ọ bụghị site nʼiwu. Ọ bụrụ na iwu asịghị, “Enwela anya ukwu,” agaraghị m ama na ọ bụ mmehie. 8Ma mmehie sitere nʼiwu a megidere ọchịchọ ọjọọ, mee ka echiche m mgbe niile bụrụ ihe gbasara ihe ọjọọ, na otu m ga-esi mee ha. A sị na iwu adịghị, mmehie agaraghị adị. 9Na mbụ, abụ m onye dị ndụ mgbe iwu na-adịghị, ma mgbe iwu bịara, e mere ka mmehie nwe ntute. 10Anwụrụ m, ma chọpụta na iwu ahụ kwesiri iwetara m ndụ ghọziri ihe wetara ọnwụ. 11Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m. 12Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma. 13Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.
Oziọma
36Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. 37Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Owuwe ihe ubi hiri nne nʼezie. Ma ndị ọrụ dị ole na ole. 38Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.” 10:1Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche. 2Nke a bụ aha ndị ozi iri na abụọ ahụ: Saimọn (onye a na-akpọkwa Pita) na Andru nwanne Saimọn; Jemis nwa Zebedi, na Jọn nwanne ya. 3Filip na Batalomi; Tọmọs na Matiu onye ọna ụtụ; Jemis nwa Alfiọs, na Tadiọs. 4Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye nʼaka ndị gburu ya. 5Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ. 6Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu. 7Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’ 8Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Jun na kalenda nzukọ bụ 5 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike